Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 1 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Ọktoba 2027
Fraịdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Teresa nke Nwa Jisọs, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Asaf. O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 2Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. 3Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ. 4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo. 5O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ? 8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. 9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.
Oziọma
13“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ. 14Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu. 15Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ! 16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Teresa nke Nwa Jisọs, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike