Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 30 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Jerom, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. 2Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara. 3O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ. 4Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam. 5Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya. 6Mgbe ahụ, Ezra gọziri Onyenwe anyị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. 7Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ. 8Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma. 9Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ. 10Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu.” 11Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.” 12Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha.
Abụ Ọma nzaghachi
7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
Oziọma
1Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ. 5“Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ. 8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’ 10Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị, 11‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’ 12Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jerom, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike