Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 28 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Septemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Wenseslọs, Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ndị nsọ Lọrens Ruiz na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Zek 8:20–23

20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa. 21Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, ka anyị chọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’ 22Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.” 23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 87:1–7

1Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ; 2Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb. 3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela 4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ” 5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.” 6Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.” 7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”

Oziọma

Luk 9:51–56

51Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem. 52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa; 53ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem. 54Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?” 55Ọ tụgharịrị bara ha mba. 56Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike