Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 27 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Septemba 2027

Mọnde · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Vinsent de Pọl, Onye ụkọchukwu · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Zek 8:1–8

1Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị, 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ana m ekwo ekworo dị ukwuu nʼihi Zayọn. Nʼezie, ekworo ahụ na-anụ m ọkụ dị ukwuu nʼahụ.” 3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m alọghachi na Zayọn, bịa biri na Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-akpọ Jerusalem, obodo Eziokwu. A ga-akpọkwa ugwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile Ugwu Nsọ.” 4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara. 5Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.” 6Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ. 8Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 102:15–20, 28, 21–22

15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. 17Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. 18Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị: 19“ Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, 20ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” 28Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.” 21Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem, 22mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

Oziọma

Luk 9:46–50

46Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu. 47Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya. 48Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.” 49Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.” 50Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike