Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 23 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 10 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 14 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Nativity of the Theotokos
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie. 2Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa. 3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 4Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. 5Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 6O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ, 7nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst. 8A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ. 9Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. 10Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst. 20Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha. 21Emesịa, agara m Siria na Silisia. 22Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị niile dị nʼala Judịa amaghị onye m bụ. 23Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.” 24Ha nyere Chineke otuto nʼihi m. 2:1Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee. 2Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. 3Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik. 4Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu. 5Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.
Oziọma
1Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin. 2Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. 3Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. 4Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. 5Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ. 6Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. 7O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” 8Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!” 9Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” 10Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ. 11Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. 12Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.” 13Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile. 14Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. 15Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha. 16Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ. 17Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha. 18Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha. 19Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.” 20Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Septemba na kalenda nzukọ bụ 23 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike