Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 22 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 9 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Septemba 2027

Wenezdee · Izu nke 14 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Nativity of the Theotokos

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 13:3–14

3Ebe unu chọrọ ka e gosi na Kraịst na-ekwu okwu nʼime m, ọ dịghị egosi adịghị ike mgbe ọ na-emeso unu omume, kama ọ na-eme ka ike ya pụta ìhè nʼebe unu nọ. 4Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke. 5Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma. 6Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ. 7Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị. 8Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu. 9Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke. 10Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ. 11Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu. 12Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu. 13Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu. 14Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.

Oziọma

Mak 4:35–41

35Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.” 36Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. 37Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. 38Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” 39Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii. 40Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” 41Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Septemba na kalenda nzukọ bụ 22 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike