Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 22 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Septemba 2027

Wenezdee · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ezr 9:5–9

5Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m 6nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe. 7Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa. 8“Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. 9Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem.

Abụ Ọma nzaghachi

Ọ dịghị na nsụgharị a

Oziọma

Luk 9:1–6

1Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche. 2O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa. 3Ọ gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, maọbụ mkpanaka maọbụ akpa, maọbụ achịcha maọbụ ego maọbụ uwe abụọ. 4Ụlọ ọbụla unu banyere, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 5Ma ebe ọbụla a na-anabataghị unu, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ nʼobodo ahụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 6Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike