Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 18 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 5 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Septemba 2027
Satọdee · Izu nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Holy Prophet Zechariah and Righteous Elizabeth, parents of St John the Baptist (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
6Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. 7Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. 8O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. 9Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
Oziọma
15Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya. 16Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ. 17Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 18Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? 19Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. 20Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?” 21Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.” 22Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.
Oziọma (maka Onye amụma Zekaraya, nna Onye bu ụzọ)
29“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume. 30Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma. 31Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma. 32Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere. 33“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? 34Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ. 35Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu. 36Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a. 37“O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a! 38Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 39Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. ”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Septemba na kalenda nzukọ bụ 18 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike