Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 19 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Septemba 2027

Sọnde · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 25 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 54:1–4, 6

1Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m. 2O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. 3Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela 4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 6Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Jem 3:16–4:3

16Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị. 17Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya. 18Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume. 4:1Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu? 2Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere. 3Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.

Oziọma

Mak 9:30–37

30Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya, 31nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.” 32Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya. 33Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?” 34Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya. 35Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.” 36Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, 37“Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike