Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 14 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 1 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Septemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Beginning of the Indiction (that is, the New Year)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ. 2O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ, na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị. O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi, 3na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma Onyenwe anyị. 4Ha ga-ewugharịkwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ nʼoge ochie, doziekwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu site nʼoge dị anya; ha ga-eme ka obodo e tikpọrọ etikpọ dị ọhụrụ, bụ ebe tọgbọrọrị nʼefu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga. 5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu; ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile. 6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị, kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị. A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu. Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi. 7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi. 8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi. 9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Lev 26:3–12, 14–17, 19–20, 22, 33, 23–25
3“ ‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile, 4aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile. 5Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu. 6“ ‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee. 7Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha. 8Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha. 9“ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide. 10Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ. 11Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi. 12Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m. 14“ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya, 15ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m, 16mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha. 17Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu. 19Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz. 20Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya. 22Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole. 33Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile. 23“ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m, 24mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu. 25Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Akwụkwọ ozi (maka afọ ọhụrụ nke Chọọchị)
1Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile, 2kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ. 3Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. 4Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu. 5Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ. 6Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya. 7Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Simiọn)
12Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. 13Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu. 14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu. 15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele. 16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
Oziọma (maka afọ ọhụrụ nke Chọọchị)
16Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. 17E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, 18“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. 19Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.” 20O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. 21Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” 22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
Oziọma (maka Onye nsọ Simiọn)
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Septemba na kalenda nzukọ bụ 14 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike