Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 13 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 31 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Septemba 2027

Mọnde · Izu nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Placing of the Venerable Sash of the Most Holy Mother of God in Constantinople (c 395-408)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 8:7–15

7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a. 8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa. 9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya. 10Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya. 11Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị. 12Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye. 13Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha. 14Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha. 15Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.”

Akwụkwọ ozi (maka Tiuzdee)

2Kọ 8:16–9:5

16Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi. 17Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka. 18Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ. 19Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka. 20Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a. 21Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa. 22Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ. 23Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto. 24Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya. 9:1Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere ozi nke ndị nsọ. 2Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dịka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nʼihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nʼobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere. 3Ugbu a, ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dịka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye. 4Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere. 5Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye.

Akwụkwọ ozi (maka eriri úkwù nke Nne Chineke)

Hib 9:1–7

1Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo. 2E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. 3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, 4nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ. 5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a. 6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ. 7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.

Oziọma

Mak 3:6–12

6Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi. 7Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya. 8Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn. 9Nʼihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debere ya ụgbọ mmiri nta nso ka ọ banye, iji gbochie igwe mmadụ ahụ ịkpagbu ya. 10Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka. 11Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” 12Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.

Oziọma (maka Tiuzdee)

Mak 3:13–19

13Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya. 14Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma, 15nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. 16Ndị a bụ mmadụ iri na abụọ ndị ọ họpụtara. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita). 17Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”), 18Andru, Filip, Batalomi, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Tadiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt, 19na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.

Oziọma (maka eriri úkwù nke Nne Chineke)

Luk 10:38–42; 11:27–28

38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 13 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike