Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 15 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 2 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Septemba 2027
Wenezdee · Izu nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Mamas of Cæsarea in Cappadocia (3rd C) and his parents Theodotus and Rufina
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke. 13Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ. 14Nke a ga-eme nʼekpere ha maka unu, ha ga-eji obi ha niile rịọọ arịrịọ, nʼihi ịdị ukwu nke amara Chineke dị nʼime unu. 15Ekele dịrị Chineke nʼihi onyinye ya dị ukwuu nke ọnụ na-apụghị ịkọ. 10:1Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu. 2Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya. 3Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị. 4Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi. 5Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst. 6Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke. 7Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Antoni na Onye nsọ Teodosiọs nke ọgba Kyiv)
28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. 29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. 30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto. 31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị? 32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya? 33Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume. 34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ. 35Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? 36Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.” 37Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. 38Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, 39maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Oziọma
20Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri. 21Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.” 22Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 23Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu? 24Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo. 25Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo. 26Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso. 27Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Septemba na kalenda nzukọ bụ 15 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike