Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 14 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Septemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mbuli elu nke Obe Nsọ
Mmemme · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
ma ọ bụ: Fil 2:6–11
4Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a. 5Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.” 6Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel. 7Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha. 8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.” 9Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ maskil nke Asaf. Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m. 2Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie; 34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike. 35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta. 36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha. 37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya. 38Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
Oziọma
13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata. 14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu. 15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” 16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. 17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike