Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 12 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Septemba 2027
Sọnde · Izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 24 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.
Abụ Ọma nzaghachi
1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere. 2Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile. 3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. 4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!” 5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. 6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. 8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, 9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
14Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya? 15Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, 16ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? 17Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya. 18Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ
Oziọma
27Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” 28Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 29Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.” 30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya. 31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị. 32Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba. 33Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.” 34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. 35Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike