Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 11 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Septemba 2027
Satọdee · Izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. 16Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. 17Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị. 2Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. 3Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto. 4Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe. 5Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu, 6onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya? 7Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
Oziọma
43“Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma. 44Ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta fiig site nʼosisi ogwu, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta mkpụrụ grepu nʼobi ogwu. 45Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya. 46“Gịnị mere unu ji na-akpọ m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu adịghị eme ihe m kwuru? 47Achọrọ m igosi unu ihe onye ọbụla na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ akpọrọ ihe, yiri. 48Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike. 49Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nʼelu ala, nke na-enweghị ntọala ọbụla. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala, ọdịda ya dị ukwuu.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike