Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 13 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Septemba 2027
Mọnde · Izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Jọn Krisọstọm, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile, 2kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ. 3Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. 4Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu. 5Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ. 6Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya. 7Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha. 8Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka.
Abụ Ọma nzaghachi
2Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ. 7Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya. 8Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya, ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ. 9Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị; buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
1Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm. 2Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ. 3Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya. 4Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a. 5Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.” 6Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. 7Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m. 8Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.” 9Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.” 10Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn Krisọstọm, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike