Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 12 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 30 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Septemba 2027

Sọnde · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 1

Mat 28:16–20

16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”

Akwụkwọ ozi

1Kọ 15:1–11

1Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya. 2E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka. 3Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. 4Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. 5O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. 6Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ. 7Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya. 8Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge. 9Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu. 10Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m. 11Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere.

Oziọma

Mat 19:16–26

16Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 17Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.” 18Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. 19Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ ” 20Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” 21Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” 22Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. 23Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. 24Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 25Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 26Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 12 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike