Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 21 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Ọgọọst 2027

Satọdee · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 20 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Pius nke Iri, Pope · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rut 2:1–3, 8–11; 4:13–17

1Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz. 2Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.” 3Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek. 8Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a. 9Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.” 10Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?” 11Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ. 4:13Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke. 14Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile. 15Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.” 16Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya. 17Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 128:1–5

1Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. 4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

Oziọma

Mat 23:1–12

1Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị, 2“Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis. 3Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. 4Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha. 5“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu. 6Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya. 7Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’ 8“Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu. 9Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe. 10Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst. 11Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 12Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike