Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 21 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 8 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Ọgọọst 2027
Satọdee · Izu nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Transfiguration of the Lord
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
6Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele. 7Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ. 8Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.
Oziọma
32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” 33Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” 34Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.” 35Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. 36O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. 37Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa. 38Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị. 39Mgbe o zilagara igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nʼobodo Magadan.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 21 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike