Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 22 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Ọgọọst 2027

Sọnde · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 21 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jos 24:1–2, 15–18

1Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke. 2Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe. 15Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.” 16Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ! 17Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. 18Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 34:1–2, 15–22

1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha; 16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. 18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. 19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. 20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie. 21Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ. 22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 5:21–32

21Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst. 22Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. 23Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. 24Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile. 25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. 26O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. 27Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. 28Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. 29Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị. 30Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya. 31“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 32Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya.

Oziọma

Jọn 6:60–69

60Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?” 61Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu? 62Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ. 63Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. 64Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye. 65Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.” 66Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya. 67Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?” 68Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. 69Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike