Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 20 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Ọgọọst 2027
Fraịdee · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 20 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Benad nke Clairvaux, Onyeisi ndị mọnk na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab. 3Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. 4Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri. 5Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ. 6Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel. 14Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ. 15Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.” 16Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m, 22Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.
Abụ Ọma nzaghachi
5Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 6Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 10Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.
Oziọma
34Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe. 35Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya: 36“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?” 37Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ 38Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile. 39Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ 40Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Benad nke Clairvaux, Onyeisi ndị mọnk na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike