Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 14 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Ọgọọst 2027
Satọdee · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 19 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: uhie
Onye nsọ Maksimilian Meri Kolbe, Onye ụkọchukwu na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe. 15Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.” 16Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ! 17Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. 18Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.” 19Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. 20Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” 21Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.” 22Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” 23Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.” 24Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.” 25Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe. 26Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị. 27Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.” 28Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha. 29Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ. 2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.” 5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 11I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Oziọma
13Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba. 14Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” 15O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Maksimilian Meri Kolbe, Onye ụkọchukwu na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike