Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 13 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 31 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Ọgọọst 2027
Fraịdee · Izu nke 8 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Forefeast of the Procession of the Venerable and Life-Creating Cross of the Lord
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. 9E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke. 10Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi. 11Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke. 12Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta. 13Achọrọ m ka unu tule ihe a nʼonwe unu, ọ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nye Chineke? 14Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. 15Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi. 16Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a. 17Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma. 18Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu. 19Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara. 20Mgbe unu zukọtara, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenwe anyị ka unu na-eri. 21Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke. 22A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a.
Akwụkwọ ozi (maka Satọdee)
1Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere. 2Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị. 4Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ. 5Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche. 6Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị. 7Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu. 8Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. 9Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.” 10Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
Oziọma
10Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” 11Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ. 12Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.” 13Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya. 14Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, 15rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. 16Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” 17Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” 18Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.
Oziọma (maka Satọdee)
30“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa. 31Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmehie na nkwulu niile. Ma agaghị agbaghara nkwulu ekwuluru Mmụọ Nsọ. 32Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa. 33“Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya. 34Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta. 35Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe. 36Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. 37Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Julaị na kalenda nzukọ bụ 13 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike