Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 9 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 27 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Ọgọọst 2027

Mọnde · Izu nke 8 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Holy Great Martyr and Healer Panteleimon († 305)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 9:13–18

13Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja? 14Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ. 15Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye. 16Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma. 17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka. 18Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Pantelemọn)

2Tm 2:1–10

1Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye. 2Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. 3Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. 4Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. 5Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị. 6Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya. 7Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile. 8Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m. 9Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.

Oziọma

Mat 16:1–6

1Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.” 2Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’ 3Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara. 4Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ. 5Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla. 6Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”

Oziọma (maka Onye nsọ Pantelemọn)

Jọn 15:17–16:2

17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Julaị na kalenda nzukọ bụ 9 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike