Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 8 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 26 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Ọgọọst 2027

Sọnde · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 7

Jọn 20:1–10

1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.

Akwụkwọ ozi

Rom 15:1–7

1Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ. 2Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. 3Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!” 4Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya. 5Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere. 6Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto. 7Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto.

Oziọma

Mat 9:27–35

27Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!” 28Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.” 29O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.” 30Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.” 31Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ. 32Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya. 33Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.” 34Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.” 35Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Julaị na kalenda nzukọ bụ 8 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike