Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 10 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 28 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Ọgọọst 2027
Tiuzdee · Izu nke 8 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Apostles of the 70 and Deacons: Prochorus, Nicanor, Timon and Parmenas (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
5Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara. 6Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha. 7Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.” 8Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị. 9Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha. 10Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu. 11Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. 12Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda.
Oziọma
6Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.” 7Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla. 8Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha? 9Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru? 10Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara? 11Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.” 12Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Julaị na kalenda nzukọ bụ 10 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike