Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 9 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Ọgọọst 2027

Mọnde · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 19 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Teresa Benedikta nke Obe (Edith Stein), Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dit 10:12–22

12Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe, 13na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị. 14Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị. 15Ma Onyenwe anyị nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa. 16Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike. 17Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. 18Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe. 19Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt. 20Tụọ Onyenwe anyị Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. 21Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ. 22Nna nna unu ndị gara nʼIjipt dị naanị iri mmadụ asaa, ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke gị emeela ka ịmụbaa dịka kpakpando nke mbara igwe.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 147:12–15, 19–20

12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị. 13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. 14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ. 15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa. 19O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel. 20O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!

Oziọma

Mat 17:22–27

22Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ. 23Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu. 24Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?” 25Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?” 26Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. 27Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike