Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 29 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Julaị 2027

Tọọzdee · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 17 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Ndị nsọ Mata, Meri na Lazarọs · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 40:16–21, 34–38

16Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime. 17O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ. 18Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha. 19Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. 20O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 21Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 34Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya. 35Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ. 36Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem. 37Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri. 38Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 84:2–5, 7, 10

2Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ. 3Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. 4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela 5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. 7Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn. 10Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.

Oziọma

Jọn 11:19–27

ma ọ bụ: Luk 10:38–42

19Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke. 20Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ. 21Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ. 22Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.” 23Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.” 24Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.” 25Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. 26Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?” 27Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike