Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 28 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Julaị 2027
Wenezdee · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
29Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị. 30Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso. 31Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka. 32Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị. 33Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya. 34Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 35Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.
Abụ Ọma nzaghachi
5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ. 6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha. 7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha. 9Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.
Oziọma
44“Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ. 45“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara. 46Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike