Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 30 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Julaị 2027
Fraịdee · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Pita Krisologọs, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Lev 23:1, 4–11, 15–16, 27, 34–38
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 4“ ‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka. 5Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị. 6Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 7Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla. 8Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ” 9Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, 10“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu. 11Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya. 15“ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu. 16Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ. 27“Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. 34“Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa. 35Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ. 36Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ. 37(“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị. 38Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)
Abụ Ọma nzaghachi
2Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une. 3Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị; 4nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb. 5O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: 9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. 10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.
Oziọma
54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? 55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom? 56Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?” 57Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.” 58Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pita Krisologọs, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike