Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 26 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Julaị 2027
Mọnde · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Ndị nsọ Joakim na Ana, Ndị mụrụ Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ. 16Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akaọrụ Chineke, ihe e dere nʼelu ha bụ ihe Chineke nʼonwe ya dekwasịrị nʼelu mbadamba nkume ndị ahụ. 17Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.” 18Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.” 19Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ. 20Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ. 21Ọ gwara Erọn okwu sị, “Gịnị ka ndị a mere gị i ji bute ụdị mmehie ọjọọ dị otu a tụkwasị ha nʼisi?” 22“Erọn zara sị ya, ka iwe gị ghara ịdị ọkụ, onyenwe m. Gị onwe gị maara ndị a, mata otu ha si bụrụ ndị ọjọọ. 23Ha sịrị m, ‘Meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.’ 24Asịrị m ha, ‘Onye ọbụla nke nwere ihe ịchọ ọma ọlaedo, ya yipu ya.’ Mgbe ahụ, ha wetara m ọlaedo ndị a, nke m tụbara nʼime ọkụ. Ihe si na ya pụta bụ nwa ehi a kpụrụ akpụ!” 30Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.” 31Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo. 32Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.” 33Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m. 34Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
Abụ Ọma nzaghachi
19Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa. 20Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha. 21Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt, 22ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie. 23Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
Oziọma
31Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya. 32Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 33Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.” 34Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. 35O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Joakim na Ana, Ndị mụrụ Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike