Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 25 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Julaị 2027

Sọnde · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 17 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Ez 4:42–44

42Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.” 43Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ” 44Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 145:10–11, 15–18

10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, 15Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru. 16I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ. 17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 4:1–6

1Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.

Oziọma

Jọn 6:1–15

1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas). 2Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa. 3Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya. 4Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso. 5Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?” 6Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme. 7Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.” 8Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, 9“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?” 10Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. 11Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ. 12Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.” 13Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ. 14Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.” 15Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike