Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 26 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 13 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Julaị 2027

Mọnde · Izu nke 6 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Synaxis of the Archangel Gabriel

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 16:17–24

17Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu. 18Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike. 19Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ. 20Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. 21Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu. 22Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị. 23Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu. 24Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen.

Oziọma

Mat 13:10–23

10Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?” 11Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya. 12Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere. 13Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya. 14Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla. 15Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ 16Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe. 17Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya. 18“Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ. 19Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ. 20Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya. 21Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. 22Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. 23Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Julaị na kalenda nzukọ bụ 26 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike