Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 27 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Julaị 2027

Tiuzdee · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 17 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 33:7–11; 34:5–9, 28

7Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 8Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ. 9Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka. 10Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala. 11Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ. 34:5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị. 6O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “ Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 7Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.” 8Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala, 9sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.” 28Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 103:6–13

6Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. 7O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: 8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; 10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. 13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,

Oziọma

Mat 13:36–43

36Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.” 37Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ. 38Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ. 39Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. 40“Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. 41Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe. 42Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze. 43Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike