Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 24 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Julaị 2027
Satọdee · Izu nke 16 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 16 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Sharbel Makhluf, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.” 4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel. 5Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị. 6Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 7Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.” 8Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Asaf. Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya. 2Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma. 5“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.” 6Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela 14“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu, 15ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
Oziọma
24Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya. 25Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa. 26Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito. 27“Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’ 28“Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’ 29“Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti. 30Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Sharbel Makhluf, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike