Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 25 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 12 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Julaị 2027

Sọnde · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 5 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 5

Luk 24:12–35

12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara. 13Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. 14Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere. 15Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije. 16Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya. 17Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha. 18Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?” 19Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile. 20Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe. 21Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a. 23Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ. 24Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.” 25Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru. 26Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?” 27Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile. 28Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. 29Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. 30Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. 31Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. 32Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” 33Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, 34na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” 35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.

Akwụkwọ ozi

Rom 10:1–10

1Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. 2Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. 3Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. 4Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere. 5Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.” 6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst) 7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.

Oziọma

Mat 8:28–9:1

28Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha. 29Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?” 30Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. 31Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.” 32Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. 33Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. 34Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha. 9:1Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Julaị na kalenda nzukọ bụ 25 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike