Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 20 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 7 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Julaị 2027

Tiuzdee · Izu nke 5 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Thomas of Mt Maleon (10th C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 14:9–18

9Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ. 10Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke. 11E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ” 12E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke. 13Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ. 14Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha. 15Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ. 16Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe. 17Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ. 18Nʼihi na onye ọbụla na-efe Kraịst nʼụzọ dị otu a, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ụmụ mmadụ na-anabatakwa ya.

Akwụkwọ ozi (maka Wenezdee)

Rom 15:7–16

7Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto. 8Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie. 9Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.” 10O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.” 11Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.” 12Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.” 13Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ. 14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. 15Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m, 16abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.

Oziọma

Mat 12:14–16, 22–30

14Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. 15Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile. 16Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ. 22Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu. 23Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?” 24Mgbe ndị Farisii nụrụ nke a, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nʼihi na Belzebub, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.” 25Ma ebe ọ matara ihe ha na-eche nʼobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Alaeze ọbụla kewara megide onwe ya ga-ada. Obodo o bụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla kewara megide onwe ya agaghị eguzo. 26Ọ bụrụ na ekwensu achụpụ ekwensu, o kewala megide onwe ya. Oleekwanụ otu alaeze ya ga-esi guzo. 27Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub, ọ bụ nʼike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nʼihi okwu a unu kwuru. 28Ma ọ bụrụ na m na-esite nʼike Mmụọ nke Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nʼetiti unu. 29“Ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo niile dị nʼụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ? Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo niile dị nʼụlọ nwoke ahụ. 30“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.

Oziọma (maka Wenezdee)

Mat 12:38–45

38Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.” 39Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma. 40Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala. 41Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a. 42Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya. 43“Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si nʼime mmadụ pụọ, ọ na-agabiga nʼọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe izuike, ma ọ naghị achọta ya. 44Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m, ebe m si pụta.’ Mgbe ọ lọghachiri, ọ na-achọpụta na a zachara ụlọ ahụ dozie ya, ọ dịkwaghị onye bichiri nʼime ya. 45Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa chọta mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha niile na-abata bịa biri nʼime onye ahụ. Mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị ndị bi nʼọgbọ a jọrọ njọ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Julaị na kalenda nzukọ bụ 20 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike