Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 18 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 5 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Julaị 2027
Sọnde · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Atanasiọs)
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Atanasiọs)
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Atanasiọs)
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Sergiọs)
31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie. 11:1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. 2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. 3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. 4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. 9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. 10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. 11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Sergiọs)
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 4
1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ. 2Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ. 3Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs. 4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso. 5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ? 6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, 7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ” 8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya. 9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a. 10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a. 11Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu. 12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
Akwụkwọ ozi
18Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume. 19Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ. 20Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume. 21Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ. 22Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. 23Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
Akwụkwọ ozi (maka otu nʼime ndị nsọ abụọ ahụ)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma
5Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. 6Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.” 7Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?” 8Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. 9Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.” 10Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile. 11Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe. 12Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.” 13Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.
Oziọma (maka otu nʼime ndị nsọ abụọ ahụ)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Julaị na kalenda nzukọ bụ 18 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike