Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 17 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 4 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Julaị 2027

Satọdee · Izu nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Saint Andrew, Archbishop of Crete († 712-726)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 6:11–17

11Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị. 12Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. 13Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume. 14Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara. 15Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị. 16Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume? 17Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.

Oziọma

Mat 8:14–23

14Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. 15Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi. 16Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. 17Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.” 18Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. 19Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” 20Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.” 21Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” 22Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.” 23Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Julaị na kalenda nzukọ bụ 17 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike