Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 13 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 30 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Julaị 2027
Tiuzdee · Izu nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Synaxis of the Twelve Glorious and All-Praised Apostles: Peter and Andrew, James and John, Phillip, Bartholomew, Thomas, Matthew, James the son of Alpheus, Jude [Thaddeus], Simon Zealotes, and Matthias
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Mọnde)
18Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi. 19Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?” 20Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’ ” 21Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ? 22Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi? 23Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a. 24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ? 25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.” 26Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ” 27Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta. 28Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.” 29Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.” 30Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe, 31ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata. 32Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ. 33Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
Akwụkwọ ozi
11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.” 12Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. 13Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.” 14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? 15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.” 16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?” 17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.” 19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.” 20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.” 21O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.” 11:1Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta. 2Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?
Akwụkwọ ozi (maka ndị ozi)
9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
Oziọma (maka Mọnde)
2Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya. 3Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?” 4Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ. 5Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye. 6Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 7Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 8Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze. 9Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma. 10Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 11Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya. 12Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya. 13Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a. 14Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa. 15Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
Oziọma
16“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha, 17“ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’ 18Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 19Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.” 20Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị.
Oziọma (maka ndị ozi)
13Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya. 14Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma, 15nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. 16Ndị a bụ mmadụ iri na abụọ ndị ọ họpụtara. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita). 17Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”), 18Andru, Filip, Batalomi, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Tadiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt, 19na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Jun na kalenda nzukọ bụ 13 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike