Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 14 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 1 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Julaị 2027

Wenezdee · Izu nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Holy Unmercenaries Cosmas and Damian, Martyrs at Rome († 284)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 11:2–12

2Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel? 3“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.” 4Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.” 5Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya. 6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu. 7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha. 8Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.” 9Devid kwukwara, “Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya, ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha. 10Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ. Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.” 11Ajụjụ ọzọ m na-ajụ bụ nke a: Ọ ga-abụ na ha sụrụ ngọngọ ka ha daa ma ghara ibilite ọzọ? Ọ bụghị otu a! Kama nʼihi mmehie ha, nzọpụta rutere ndị mba ọzọ ka e sitekwa na nke a kpalie ekworo nʼime ụmụ Izrel. 12Ma ọ bụrụ na mmehie ha wetara akụnụba nye ụwa, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye ha wetara ngọzị nye ndị mba ọzọ, ọ bụ na ngọzị babigara ụba oke agaghị adị mgbe a ga-agụkọta ọnụọgụgụ ha niile?

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Kọsmas na Onye nsọ Damian)

1Kọ 12:27–13:8

27Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ. 28Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche. 29Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube? 30Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche? 31Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma. 13:1A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda. 2A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla. 3A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya. 4Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. 5Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. 6Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. 7Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara. 8Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.

Oziọma

Mat 11:20–26

20Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị. 21“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi. 22Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. 23Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. 24Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.” 25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. 26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.

Oziọma (maka Onye nsọ Kọsmas na Onye nsọ Damian)

Mat 10:1, 5–8

1Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 5Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ. 6Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Julaị na kalenda nzukọ bụ 14 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike