Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 7 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 24 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Julaị 2027

Wenezdee · Izu nke 3 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Nativity of the Holy Glorious Prophet, Forerunner, and Baptist of the Lord, John

Obubu ọnụ Ndị Ozi

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 17:15–17, 19; 18:11–14; 21:1–8

15Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera. 16Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.” 17Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?” 19Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 18:11Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa. 12Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?” 13Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’ 14Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” 21:1Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa. 2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa. 3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik. 4Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu. 5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke. 6Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.” 7O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.” 8Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Nkp 13:2–8, 13–14, 17–18, 21

2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. 3Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. 4Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ. 5Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.” 6Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya. 7Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ” 8Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.” 13Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya. 14Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.” 17Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?” 18Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” 21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ha hụrụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 40; Aịz 41; Aịz 45; Aịz 48; Aịz 54 (amaokwu a họọrọ)

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Luk 1:24–25, 57–68, 76, 80

24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.” 57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. 59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, 60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” 61Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.” 62Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. 63Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. 64Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke. 65Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa. 66Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya. 67E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị, 68“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya. 76“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ. 80Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.

Akwụkwọ ozi (maka Onye bu ụzọ)

Rom 13:11–14:4

11Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. 12Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè. 13Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo. 14Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya. 14:1Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. 2Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. 3Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. 4Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.

Oziọma (maka Onye bu ụzọ)

Luk 1:1–25, 57–68, 76, 80

1Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị. 2Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi. 3Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ. 4Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị. 5Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn. 6Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla. 7Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi. 8O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke. 9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. 10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere. 11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya. 12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu. 13Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn. 14Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya. 15Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ. 16Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha. 17Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.” 18Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.” 19Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a. 20Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” 21Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ. 22Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu. 23Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya. 24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.” 57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. 59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, 60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” 61Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.” 62Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. 63Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. 64Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke. 65Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa. 66Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya. 67E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị, 68“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya. 76“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ. 80Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Jun na kalenda nzukọ bụ 7 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike