Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 8 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Julaị 2027
Tọọzdee · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
18Juda jekwuuru ya, sị, “Biko, onyenwe m, kwere ka ohu gị gwa gị okwu. Ewesola mụ bụ ohu gị iwe nʼihi na ị nọ ọnọdụ dị ka Fero. 19Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’ 20Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’ 21“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’ 23Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’ 24Mgbe anyị lakwuuru ohu gị bụ nna anyị, anyị gwara ya okwu onyenwe m kwuru. 25“Mgbe nna anyị gwara anyị sị, ‘Laghachi gaa zụta nri,’ 26anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’ 27“Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ. 28Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya. 29Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’ 45:1Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ. 2O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara. 3Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya. 4Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt. 5Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a.
Abụ Ọma nzaghachi
16O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri; 17o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu. 18Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu, 19tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu. 20Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya. 21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
Oziọma
7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu. 9“Mgbe unu na-aga, unu anatala ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ ọla ọbụla tinye nʼime belịt unu. 10Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya. 11Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ. 12Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu. 13Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu. 14Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu. 15Nʼeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nʼụbọchị ikpe karịa obodo Sọdọm na Gọmọra.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike