Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 4 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Julaị 2027
Sọnde · Izu nke 14 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 14 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
2Mmụọ ahụ banyere nʼime m mgbe ahụ ọ na-ekwu okwu, mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Anụrụ m ka ọ gwara m okwu. 3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị Izrel, ndị bụ mba na-enupu isi, ndị nupuru isi megide m. Ha na nna nna ha enupula isi megide m, ruo ọ bụladị nʼụbọchị taa. 4Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu.’ 5Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. 2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. 3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. 4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
7Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa. 8Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. 9Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. 10Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
Oziọma
1Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa. 2Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ? 3Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ. 4Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.” 5Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha. 6Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Elizabet nke Pọtugal
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike