Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 4 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 21 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Julaị 2027

Sọnde · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Ndị nsọ niile nke Amerịka; Ndị nsọ niile nke Rọshịa

Obubu ọnụ Ndị Ozi

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 43:9–14

9Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 2

Mak 16:1–8

1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.

Akwụkwọ ozi

Rom 2:10–16

10Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ. 11Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu. 12Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo. 13Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume. 14Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede. 15Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ. 16Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.

Akwụkwọ ozi (maka ndị nsọ)

Hib 11:33–12:2

33ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm. 34Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ. 35Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma. 36E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ. 37A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ. 38Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu. 39A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. 40Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị. 12:1Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. 2Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.

Oziọma

Mat 4:18–23

18Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. 19Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 20Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya. 21Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, 22ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya. 23Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.

Oziọma (maka ndị nsọ)

Mat 4:25–5:12

25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya. 5:1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: 3“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Jun na kalenda nzukọ bụ 4 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike