Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 28 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 15 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Jun 2027

Mọnde · Izu nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Holy Prophet Amos (8th C BC)

Obubu ọnụ Ndị Ozi

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 2:28–3:18

28Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ. 29Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke. 3:1Ọ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nʼihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke dị na-ebiri mmadụ ugwu? 2Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nʼaka. 3Gịnị ga-emezi ma ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime ha ekwesighị ntụkwasị obi? Chineke, ọ ga-eji nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha ghara ikwesi ntụkwasị obi? 4Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.” 5Ma ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nʼihi ajọ omume anyị? (Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ.) 6Nʼezie, ọ bụghị otu a, ọ bụrụ na ọ bụ otu a, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe? 7Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?” 8Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi. 9Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ. 10Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye. 11Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke. 12Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye. 13Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. 14Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ. 15Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara. 16Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile. 17Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo. 18Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”

Oziọma

Mat 6:31–34; 7:9–11

31Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’ 32Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa. 33Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. 34Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa. 7:9“Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? 10Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? 11Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Jun na kalenda nzukọ bụ 28 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike