Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 23 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Jun 2027
Wenezdee · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 12 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.” 2Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.” 3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.” 4Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.” 6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. 7Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.” 8Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?” 9Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.” 10Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ. 11Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha. 12Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya. 17Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee. 18Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis.
Abụ Ọma nzaghachi
1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
Oziọma
15“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ. 16A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig? 17Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ. 18Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma. 19Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ. 20Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike