Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 22 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Jun 2027

Tiuzdee · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 12 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Pọlinọs nke Nola, Bishọp · Ncheta a na-ahọrọ

Ndị nsọ Jọn Fisher, Bishọp, na Tọmọs More, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 13:2, 5–18

2Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo. 5Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu. 6Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ. 7Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ. 8Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne. 9Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.” 10Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.) 11Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara. 12Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm. 13Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide Onyenwe anyị. 14Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. 15Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi. 16Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị. 17Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.” 18Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 15:2–5

2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya. 3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya, 4onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya, 5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.

Oziọma

Mat 7:6, 12–14

6“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị. 12Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri. 13“Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya. 14Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike