Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 21 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Jun 2027

Mọnde · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 12 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Aloysius Gonzaga, Onye okpukpe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 12:1–9

1Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị. 2“Aga m eme gị mba ukwu, aga m agọzi gị, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, ị ga-abụ ngọzị. 3Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 4Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije. 5O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ. 6Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ. 7Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya. 8Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. 9Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 33:12–13, 18–20, 22

12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. 20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.

Oziọma

Mat 7:1–5

1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. 2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu. 3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ. 5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike