Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 11 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Jun 2027

Fraịdee · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 10 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Banabas, Onyeozi · Ncheta

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 11:21–26; 13:1–3

21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị. 22Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk. 23Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị. 24Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị. 25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl. 26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst. 13:1Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl. 2Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.” 3Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 116:10–11, 15–18

10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,” 11nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.” 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

Oziọma

Mat 5:27–32

27“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’ 28Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ. 29Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. 30Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. 31“E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’ 32Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike